1 Chronicles 20

Ndọta adọtara Raba

1Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Joab duuru ndị agha pụọ ibu agha. O bibiri ala ndị Amọn niile, gaa Raba nọchibido ya, ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. Joab busoro Raba agha, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. 2Devid kpupuru okpueze nke dị eze ha nʼisi, ahụtara nʼịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma, e kpunyere ya Devid nʼisi. O sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 3Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala, na anyụike na-arụ. Otu a ka Devid mekwara obodo niile nke ndị Amọn. Emesịa, Devid na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.

Agha megide ndị Filistia

4Mgbe oge gatụrụ, agha ọzọ daara ha na ndị Filistia, na Gaza. Mgbe ahụ, Sibekai, onye Husha, gburu Sipai, otu nʼime ndị agbụrụ Refaim. Nke a mere ka ndị Filistia chilie aka ha elu, bụrụ ndị a lụgburu nʼagha.

5Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ, Elhanan, nwa Jaịa, gburu Lami nwanne Golaịat, onye Gat. Onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.

6Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa. 7Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimea, nwanne Devid gburu ya.

8Ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile.

Copyright information for IboBIU